6. Ub͕u a, Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, bú ndi-Afasakait, ndi nọ n'ofè osimiri, dinu n'ebe di anya site n'ebe ahu:
7. rapunu ọlu ulo a nke Chineke; kwe ka onye-isi ndi-Ju na ndi-okenye ndi-Ju wue ulo a nke Chineke n'ọnọdu-ya.
8. Anēsite kwa n'akam nye iwu bayere ihe unu gēme ndi-okenye ahu nke ndi-Ju iwu ulo a nke Chineke: ka eme ngwa si n'àkù eze, bú nke sitere n'utu anātu n'ofè osimiri, nye ndikom ahu ego iji lu ọlu ahu, ka ha ghara ikwusi.
9. Ihe di kwa ha nkpà, ma umu-oke-ehi, ma ebulu, ma umu-aturu, iji churu Chineke nke elu-igwe àjà-nsure-ọku, ma ọka wheat, ma nnú, ma manya-vine, ma manu, dika okwu-ọnu ndi-nchu-àjà si di, bú ndi nọ na Jerusalem, ka ewere ya nye ha kwa-ubọchi nēmehiegh:
10. ka ha we nēweta nso ihe ísì utọ nye Chineke nke elu-igwe, nēkpe kwa ekpere bayere ndu eze, na nke umu-ya ndikom.
11. Anēsite kwa n'akam nye iwu, na onye ọ bula nke gāb͕anwe okwu a, ka adọputa osisi n'ulo-ya, bulie onye ahu kpọgide ya n'elu ya; ka eme kwa ulo-ya ebe-ikpofu-ahihia n'ihi nka:
12. Chineke kwa Nke mere aha-Ya ka o biri n'ebe ahu, Ya tudà eze na ndi ọ bula nke gēseti aka-ya ib͕anwe okwu a, na ime ka ulo a nke Chineke nke di na Jerusalem la n'iyì. Mu onwem, bú Dariọs, enyewo iwu; ka ewere ngwa ngwa me ya.
13. Mb͕e ahu Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, dika ozi ahu si di nke Daraiọs, bú eze, ziri, otú a ka ha were ngwa ngwa me.