4. akuku atọ nke nkume nkpọrè, na otù ariri osisi ọhu: ka esi kwa n'ulo eze nye ego iji lu ọlu ahu:
5. ọzọ kwa, ka enyeghachi ihe ọla-edo na ọla-ọcha nke ulo Chineke, bú nke Nebukadneza chiputara n'ulo uku Chineke nke di na Jerusalem, chita na Babilon, ka achighachi kwa ha n'ulo uku Chineke nke di na Jerusalem, ihe ọ bula n'ọnọdu-ya, gi dọba kwa ha n'ulo Chineke.
6. Ub͕u a, Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, bú ndi-Afasakait, ndi nọ n'ofè osimiri, dinu n'ebe di anya site n'ebe ahu: