Ezra 6:18-21 Bible Nso (IGBOB)

18. Ha we guzo ndi-nchu-àjà nime nkewa-ha, na ndi Livai n'òkè-ha, bayere òfùfè Chineke, nke di na Jerusalem; dika edere ya n'akwukwọ Moses.

19. Umu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ we me ememe ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa mbu.

20. N'ihi na ndi-nchu-àjà na ndi Livai mere onwe-ha ka ha di ọcha n'otù; ha nile di ọcha: ha we b͕uere umu nile nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ anu ngabiga, b͕u-kwa-ra umu-nne-ha, bú ndi-nchu-àjà, b͕u-kwa-ra onwe-ha.

21. Umu Israel we rie, bú ndi nēsi n'etiti ndi emere ka ha je birl n'ala ọzọ lata, ha na onye ọ bula nke nēkewapu onwe-ya n'ọrurú nke mba nile nke ala ahu iso ha, ichọ Jehova, bú Chineke Israel,

Ezra 6