Ezra 2:28-41 Bible Nso (IGBOB)

28. Ndikom Bet-el na Ai, ọgu iri-na-otù na atọ.

29. Umu Nebo, ọgu abua na iri na abua.

30. Umu Magbish, ọgu asa na iri na isi.

31. Umu Ilam nke-ọzọ, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ.

32. Umu Harim, ọgu iri-na-isi.

33. Umu Lod na Hadid na Ono, nnù na ọgu iri-na-isi na ise.

34. Umu Jeriko, ọgu iri-na-asa na ise.

35. Umu Senaa, nnù iteghete na orú na iri.

36. Ndi-nchu-àjà: umu Jedaia, nke ulo Jeshua, nnù abua na ọgu asatọ na iri na atọ.

37. Umu Imea, nnù abua na ọgu iri-na-abua na iri na abua.

38. Umu Pashua, nnù atọ na ọgu abua na asa.

39. Umu Harim, nnù abua na ọgu iri na iri na asa.

40. Ndi Livai: umu Jeshua na Kadmiel, nke umu Hodavaia, ọgu atọ na iri na anọ.

41. Ndi-ọbù-abù: umu Esaf, ọgu isi na asatọ.

Ezra 2