6. Ezra we si n'iru ulo Chineke bilie, jerue ime-ulo Jehohanan nwa Elaiashib: o we je n'ebe ahu, ma o righi nri, ọ ṅughi kwa miri: n'ihi na o nēru újú n'ihi nmekpu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ.
7. Ha we kwusa nime Juda na Jerusalem gwa umu nile nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ka ha chikọta onwe-ha na Jerusalem;
8. ka ewezuga kwa àkù-ya nile ibibi ya, kewapu kwa onye ahu na nkpọkọta ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú onye ọ bula nke nābiaghi n'ubọchi atọ, dika ndum-ọdu ndi-isi na ndi-okenye si di.
9. Ndikom nile nke Juda na Benjamin we chikọta onwe-ha na Jerusalem n'ubọchi atọ; nke ahu bu ọnwa nke-iteghete, n'ubọchi nke-orú n'ọnwa ahu: ndi ahu nile we nọdu n'amá ulo Chineke, nāma jijiji n'ihi okwu a, na site n'oké miri-ozuzo nile.
10. Ezra, bú onye-nchu-àjà, we bilie, si ha, Unu onwe-unu emekpuwo emekpu, luta ndinyom ala ọzọ, itukwasi ihe n'ikpe-ọmuma Israel.
11. Ma ub͕u a nyenu Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, ekele, me kwa ihe nātọ Ya utọ: kewaputa-kwa-nu onwe-unu n'aru ndi di iche iche nke ala nka, na n'aru ndinyom ala ọzọ.
12. Nkpọkọta ahu nile we were oké olu za, si, O ziri ezi, dika okwu-gi nile n'ebe ayi nọ si di, ayi aghaghi ime otú a.