17. Ha we jubìe ajuju n'okwu ndikom nile ndi lutaworo ndinyom ala ọzọ n'ubọchi mbu nke ọnwa mbu.
18. Ewe chọta ufọdu n'etiti umu ndi-nchu-àjà ndi lutaworo ndinyom ala ọzọ: bú, n'etiti umu Jeshua, nwa Jozadak, na umu-nne-ya: Maaseia, na Elieza, na Jarib, na Gedalaia.
19. Ha we nye aka-ha ime ka ndinyom-ha pua; ebe ikpe mara ha, ha we nye ebulu nke ìgwè aturu n'ihi ikpe-ọmuma-ha.
20. Na n'etiti umu Imea; Hanani na Zebadaia.
21. Na n'etiti umu Harim; Maaseia, na Elaija, na Shemaia, na Jehiel, na Uzaia.