3. Site n'ọtùtù a ka i gātù kwa, ogologo nke gādi orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, na obosara nke gādi orú nnù ami na nnù ise: ọ bu kwa nime ya ka ebe nsọ, nke bu ebe di nsọ kachasi ebe nsọ nile, gādi.
4. Òkè nsọ nke ala ahu ka ọ bu; ndi-nchu-àjà, bú ndi-oje-ozi nke ebe nsọ, gēnwe ya, bú ndi nābia nso ijere Jehova ozi; ọ gābu-kwa-ra ha ebe ulo nile ha gādi, na ebe nsọ diri ebe nsọ nkem.
5. Orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, na orú nnù ami na nnù ise n'obosara, gādiri ndi Livai, bú ndi-oje-ozi nke ulom, ighọrọ ha ihe-onwunwe, orú ime-ulo.
6. Ihe-onwunwe nke obodo a ka unu gēnye kwa, nnù ami iri-na-abua na ọgu iri ka obosara-ya gādi, ogologo-ya gādi kwa orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, n'akuku àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ: ulo Israel nile gēnwe ya.
7. Ihe onye-isi-unu nwere gādi kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ nke àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na nke ihe-onwunwe nke obodo a, n'iru àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na n'iru ihe-onwunwe nke obodo a, n'akuku Ọdida-anyanwu chere iru n'Ọdida-anyanwu, na n'akuku Iru-anyanwu chere iru n'Iru-anyanwu: ogologo-ya gādi kwa n'akuku otù nime òkè ndia, site n'ókè-ala Ọdida-anyanwu rue ókè-ala Iru-anyanwu.
8. N'ala nka ọ gāburu ya ihe-onwunwe n'Israel: ndi-isim agaghi-eme kwa ndim ihe-ike ọzọ; kama ala nka ka ha gēnye ulo Israel dika ebo nile ha si di.
9. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: O zuwo unu, unu ndi-isi Israel: wezuganu ime-ihe-ike na ipunara-madu-ihe, menu ihe ekpere n'ikpe na ezi omume; wepunu nchupu-unu nile n'aru ndim; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
10. Ihe-osìsì ziri ezi, na ephah ziri ezi, na bath ziri ezi, ka unu gēnwe.