Ezikiel 44:20-23 Bible Nso (IGBOB)

20. Ha agaghi-akọpu kwa isi-ha, ha agaghi-eme kwa ka agiri-isi-ha to ogologo; nání nkpacha ka ha gākpacha isi-ha.

21. Ọ dighi kwa manya-vine onye-nchu-àjà ọ bula gāṅu, mb͕e ha nābata n'ogige di nime.

22. Ọ dighi kwa nwanyi nke di-ya nwuru, ma-ọbu nwanyi nke achupuru achupu, ka ha gālu na nwunye: kama umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke ndi sitere na nkpuru ulo Israel, ma-ọbu nwanyi di-ya nwuru nke bu nwunye onye-nchu-àjà nwuru anwu, ka ha gālu.

23. Ọ bu kwa ndim ka ha gēzí ihe di iche n'etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, ọ bu kwa ihe di iche n'etiti ihe di ọcha na ihe ruru árú ka ha gēme ka ha mara.

Ezikiel 44