7. Ma mb͕idi nke di n'èzí n'akuku ime-ulo nile, n'uzọ ogige di n'èzí n'iru ime-ulo ahu, ogologo-ya di ọgu cubit abua na iri.
8. N'ihi na ogologo nke ime-ulo nke diri ogige di n'èzí di ọgu cubit abua na iri: ma, le, n'iru ulo uku Chineke ọ di ọgu cubit ise.
9. Site kwa n'okpuru ime-ulo ndia ka nbata di n'akuku Iru-anyanwu, ebe anēsi n'ogige di n'èzí abata nime ha.
10. N'ib͕idi nke mb͕idi ogige n'uzọ Iru-anyanwu, n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, na n'iru ulo ahu anēwu ewu, ka ime-ulo di iche iche di.
11. Uzọ nke di n'iru ha di kwa ka uzọ nke ime-ulo nke di n'uzọ Ugwu si di n'ile ha anya; dika ogologo-ha si di, otú a ka obosara-ha di: ọpùpù nile ha di ka ikpé nile ha si di, na dika ọnu-uzọ nile ha si di.
12. Ma dika ọnu-uzọ nile nke ime-ulo nile si di nke di n'uzọ Ndida, otú a ka otù ọnu-uzọ si di nke di n'isi uzọ, bú uzọ nke di n'iru mb͕idi n'uzọ Iru-anyanwu, ebe anābà nime ha.