Ezikiel 42:18-20 Bible Nso (IGBOB)

18. Akuku Ndida ka ọ tùru, nnù ami na ọgu ise, o were ami ahu o ji atù ihe tùa ya.

19. O chigharia n'akuku Ọdida-anyanwu, were ami o ji atù ihe tùa ya, nnù ami na ọgu ise.

20. N'akuku anọ ka ọ tùru ya: o nwere mb͕idi buruburu n'akuku nile, ogologo-ya di nnù na ọgu ise, obosara-ya di kwa nnù na ọgu ise, ikpa ókè n'etiti ihe di nsọ na ihe emere ka ọ ghara idi nsọ.

Ezikiel 42