Ezikiel 40:32-37 Bible Nso (IGBOB)

32. O we me ka m'bata n'ogige di nime n'uzọ Iru-anyanwu: o we tùa ọnu-uzọ-ama ahu dika ọtùtù ndia si di:

33. na ime-ulo-ya nile, na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, na ulo-nbata-ya nile, dika ọtùtù ndia si di: window di-kwa-ra ya, di-kwa-ra ulo-nbata-ya nile buruburu n'akuku nile: ogologo-ya di ọgu cubit abua na iri, obosara-ya di kwa orú cubit na ise.

34. Ulo-nbata-ya nile che-kwa-ra iru n'ogige di n'èzí; nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua, n'otù akuku na n'akuku ọzọ: ọ bu kwa nzọ-ukwu asatọ iji arigo ka ihe-nrigo-ya nwere.

35. O we me ka m'biarue ọnu-uzọ-ama nke Ugwu, o we tùa ya dika ọtùtù ndia si di;

36. ime-ulo-ya nile, na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, na ulo-nbata-ya nile; window di-kwa-ra ya buruburu n'akuku nile: ogologo-ya di ọgu cubit abua na iri, obosara-ya di kwa orú cubit na ise.

37. Akuku-ọnu-uzọ-ya abua chere iru n'ogige di n'èzí; nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua, n'otù akuku, na n'akuku ọzọ: ọ bu kwa nzọ-ukwu asatọ iji arigo ka ihe-nrigo nwere.

Ezikiel 40