Ezikiel 40:24-35 Bible Nso (IGBOB)

24. O we me ka m'je n'uzọ Ndida, ma le, otù ọnu-uzọ-ama di n'uzọ Ndida: o we tùa akuku-ọnu-uzọ-ya abua na ulo-nbata-ya nile dika ọtùtù ndia si di.

25. Window di-kwa-ra ya, di-kwa-ra ulo-nbata-ya nile buruburu n'akuku nile, dika window ndia: ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, obosara-ya di kwa orú cubit na ise.

26. Ihe-nrigo nke nwere nzọ-ukwu asa di kwa iji arigo ya, ulo-nbata-ya nile di kwa n'iru ha: o nwe-kwa-ra nkwu, otù n'otù akuku, otù n'akuku nke-ọzọ, n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua.

27. Otù ọnu-uzọ-ama di-kwa-ra ogige di nime n'uzọ Ndida: o we tùa site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ n'uzọ Ndida, ọgu cubit ise.

28. O we me ka m'si n'ọnu-uzọ-ama nke Ndida ba n'ogige di nime: o we tùa ọnu-uzọ-ama nke Ndida dika ọtùtù ndia si di;

29. na ime-ulo-ya nile, na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, na ulo-nbata-ya nile, dika ọtùtù ndia si di: window di-kwa-ra ya, di-kwa-ra ulo-nbata-ya nile buruburu n'akuku nile: ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, obosara-ya di kwa orú cubit na ise.

30. Ulo-nbata di kwa ya buruburu n'akuku nile, ogologo-ha di orú cubit na ise, obosara-ha di kwa cubit ise

31. Ulo-nbata-ya nile chere iru n'ogige di n'èzí; nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua: nzọ-ukwu asatọ iji arigo ka ihe-nrigo-ya nwere.

32. O we me ka m'bata n'ogige di nime n'uzọ Iru-anyanwu: o we tùa ọnu-uzọ-ama ahu dika ọtùtù ndia si di:

33. na ime-ulo-ya nile, na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, na ulo-nbata-ya nile, dika ọtùtù ndia si di: window di-kwa-ra ya, di-kwa-ra ulo-nbata-ya nile buruburu n'akuku nile: ogologo-ya di ọgu cubit abua na iri, obosara-ya di kwa orú cubit na ise.

34. Ulo-nbata-ya nile che-kwa-ra iru n'ogige di n'èzí; nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua, n'otù akuku na n'akuku ọzọ: ọ bu kwa nzọ-ukwu asatọ iji arigo ka ihe-nrigo-ya nwere.

35. O we me ka m'biarue ọnu-uzọ-ama nke Ugwu, o we tùa ya dika ọtùtù ndia si di;

Ezikiel 40