17. O we me ka m'bata n'ogige di n'èzí, ma, le, ime-ulo di iche iche na pavement di, nke emeworo nye ogige ahu buruburu n'akuku nile: orú ime-ulo na iri di na pavement ahu.
18. Pavement ahu di kwa n'akuku ọnu-uzọ-ama nile, na nso ogologo nke ọnu-uzọ-ama, bú pavement nke dikari ala.
19. O we tùa obosara-ya site n'iru ọnu-uzọ-ama ahu nke dikari ala rue iru nke ogige di nime n'èzí, ọgu cubit ise, n'akuku Iru-anyanwu na n'akuku Ugwu.
20. Ọnu-uzọ-ama ahu kwa nke nēche iru n'uzọ Ugwu, bú ọnu-uzọ-ama nke ogige di n'èzí, o tùru ogologo-ya na obosara-ya.