Ezikiel 40:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. N'arọ nke-orú-na-ise nke emere ka ayi je biri n'ala ọzọ, n'isi-nmalite arọ ahu, n'ubọchi nke-isi nke ọnwa, n'arọ nke-iri-na-anọ site na mb͕e etikpọsiri obodo-ayi, n'otù ubọchi ahu, aka Jehova dim n'aru, O we me ka m'bia n'ebe ahu.

2. N'ọhù di iche iche nke Chineke ka O mere ka m'bata n'ala Israel, Ọ dọbam n'ugwu di elu nke-uku, nke ihe dika obodo anēwu ewu di n'elu ya n'akuku Ndida.

3. O we me ka m'bia n'ebe ahu, ma le, otù nwoke, ma ele ya anya ọ di ka ọla si di n'ile ya anya, eriri flax di kwa n'aka-ya, ya na amì eji atù ihe; onye ahu nēguzo kwa n'ọnu-uzọ-ama.

Ezikiel 40