Ezikiel 39:9-13 Bible Nso (IGBOB)

9. Ndi bi n'obodo nile nke Israel gāpu kwa, chiri ihe-agha funwue ọku sure ha, ma ọta ma ọta uku, ma uta ma àkú, ma nkpa-n'aka, ma ube, ha gāchiri ha funwue ọku arọ asa:

10. ha ewe ghara ikpata nkú n'ọhia, ha agaghi-eb͕utu kwa nkú n'oké ọhia; n'ihi na ha gāchiri ihe-agha funwue ọku: ha gākwata kwa ndi-nkwata-ha, luta kwa ndi-nluta-ha n'agha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

11. O gēru kwa n'ubọchi ahu, na M'gēnye Gog otù ebe ílì ozu n'Israel, bú ndagwurugwu nke ndi-ngabiga n'akuku Iru-anyanwu nke oké osimiri: ihe nēb͕ochibido ndi-ngabiga ka ọ gābu: ha gēlì kwa n'ebe ahu Gog na ìgwè ndi-ya nile: ha ewe kpọ ya, Ndagwurugwu Hamon-Gog.

12. Ma ọnwa asa ka ulo Israel gānọ nēlì ha, ka ha we me ka ala-ha di ọcha.

13. E, ndi nile nke ala ahu gēli ha; ọ gāghọ-kwa-ra ha aha, n'ubọchi agāsọpurum; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Ezikiel 39