6. M'gēziga ọku n'aru Megog na n'aru ndi bi n'agwe-etiti nile na ntukwasi-obi: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.
7. Aha nsọm ka M'gēme kwa ka amara ya n'etiti ndim, bú Israel; M'gaghi-ekwe kwa ọzọ ka eme ka aha nsọm ghara idi nsọ: mba nile ewe mara na Mu onwem bu Jehova, Onye nsọ nọ n'Israel.
8. Le, ọ nābia, ọ gēme kwa, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta); nka bu ubọchi ahu nke M'kwuworo okwu bayere ya.
9. Ndi bi n'obodo nile nke Israel gāpu kwa, chiri ihe-agha funwue ọku sure ha, ma ọta ma ọta uku, ma uta ma àkú, ma nkpa-n'aka, ma ube, ha gāchiri ha funwue ọku arọ asa: