16. i gārigo kwa imegide ndim, bú Israel, dika igwe-oji ikpuchi ala; n'ikpe-azu nke ubọchi ndia ka ọ gēru, na M'gēme ka i biakwasi alam, ka mba nile we maram, mb͕e agēdowomri nsọ nime gi n'anya-ha, gi Gog.
17. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ bu gi onwe-gi bu onye ahu nke M'kwuru okwu bayere ya na mb͕e ochie site n'aka ndi-orùm, bú ndi-amuma Israel, ndi nēbu amuma n'ubọchi ahu ọtutu arọ, si, na M'gēme ka i biakwasi ha?
18. Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, n'ubọchi Gog nābia imegide ala Israel, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), na ọnumam gārigota n'imim.
19. Ọ bu kwa n'ekworom n'ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M'kwuworo, si, N'ezie n'ubọchi ahu ime-nkpatu uku gādi n'elu ala Israel;
20. azù nile nke oké osimiri, na anu-ufe nke elu-igwe, na anu ọhia, na ihe nile nke nākpu akpu, bú nke nākpu akpu n'ala, na madu nile ndi nọ n'elu uwa, ewe me nkpatu site n'irum, agākwatu kwa ugwu nile, ebe nile di nkputankpu gāda kwa, mb͕idi nile ọ bula gādaru kwa ala.