Ezikiel 38:13-15 Bible Nso (IGBOB)

13. Sheba na Dedan na ndi-ahia Tashish na umu-ọdum-ya nile gāsi gi, Ọ̀ bu ikwata ihe-nkwata ka gi onwe-gi nābia? ọ̀ bu iluta ihe-nluta n'agha ka i kpọkọtaworo nkpọkọta ndi-gi? ọ̀ bu ibupu ọla-ọcha na ọla-edo, ichipu anu-ulo na ihe-ahia, ikwata oké ihe-nkwata?

14. N'ihi nka bue amuma, nwa nke madu, si Gog, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ bughi n'ubọchi ahu mb͕e ndim, bú Israel, bi na ntukwasi-obi ka i gāmara ya?

15. I gēsi kwa n'ebe-gi, n'akuku nile nke Ugwu dikarisiri anya, bia, gi onwe-gi, na ọtutu ndi di iche iche so gi, ndi nānọkwasi inyinya ka ha nile bu, ha bu nkpọkọta madu di uku na usu-ndi-agha bara uba:

Ezikiel 38