Ezikiel 36:9-16 Bible Nso (IGBOB)

9. N'ihi na, le, Mu onwem diri unu, M'gēche kwa unu iru, agālu kwa unu dika ubi, gha unu ihe:

10. M'gēme kwa ka madu ba uba n'elu unu, bú ulo Israel nile, ha nile: madu gēbi kwa n'obodo-unu nile, ọ bu kwa nkpọnkpọ ebe nile unu ka agēwu:

11. M'gēme kwa ka madu na anumanu ba uba n'elu unu; ha gāba kwa uba, mua ọmùmù: M'gēme kwa ka madu bi nime unu dika ọnọdu mb͕e ochie unu si di, M'gēme kwa unu nma karia na mb͕e mbu unu: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

12. M'gēme kwa ka madu jegharia n'elu unu, ọbuná ndim, bú Israel; ha gēnweta kwa gi, i gāghọ-kwa-ra ha ihe-nketa, i gaghi-ab͕aba kwa ha aka umu ọzọ ma-ọli.

13. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na ha nāsi unu, Ala nke nēri madu ka i bu, ala nke nāb͕aba mba-gi aka umu ka i buworo;

14. n'ihi nka i gaghi-eri kwa madu ọzọ, i gaghi-ab͕aba kwa mba-gi aka umu ọzọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta);

15. M'gaghi-eme kwa ka i nuru ọnọdu-ihere mba nile ọzọ, i gaghi-ebu kwa ita-uta nke ndi nile di iche iche ọzọ, i gaghi-eme kwa ka mba-gi su ngọngọ ọzọ; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

16. Okwu Jehova we ruem nti, si,

Ezikiel 36