Ezikiel 36:36-38 Bible Nso (IGBOB)

36. Mba nile nke fọduru n'ala di unu buruburu gāma kwa na Mu onwem, bú Jehova, ewuwo ebe nile akwaturu akwatu, ku kwa ubi nke tọb͕ọrọ n'efu: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu, M'gēme kwa ya.

37. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọzọ, nka ka M'gēkwe ka ulo Israel juam ase bayere ya, ka M'we mere ha ya; M'gēme ka ha ba uba na madu dika ìgwè ewu na aturu.

38. Dika ìgwè ewu na aturu di nsọ, dika ìgwè ewu na aturu nke Jerusalem na mb͕e-ya nile akara àkà; otú a ka nkpọnkpọ obodo nile gējuputa na ìgwè ewu na aturu nke bu madu: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Ezikiel 36