17. O rue, n'arọ nke-iri-na-abua, n'ubọchi nke-iri-na-ise ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,
18. Nwa nke madu, bùara ìgwè ndi Ijipt abù ákwá, me ka ha rida, ya na umu-ndinyom nke mba di iche iche di ebube, rue ala di n'okpuru uwa, ha na ndi nārida n'olùlù.
19. Ònye ka i tọkariri n'utọ? rida, ka eme kwa ka i soro ndi anēbighi úgwù dina.
20. N'etiti ndi ejiri mma-agha b͕u ka ha gāda: ewerewo ya nye mma-agha: kpupunu ya na ìgwè ndi-ya nile.
21. Ndi di ike nke ndi-dike gēsi n'etiti ala-mọ gwa ya okwu, ha na ndi nēyere ya aka: ha aridawo, ha edinawo ala, bú ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u.