16. Emerem ka mba nile me nkpatu site n'olu nke ọdida-ya, mb͕e M'mere ka ọ ridarue ala-mọ, ya na ndi nārida n'olùlù: ewe kasie osisi nile nke Iden obi n'ala di n'okpuru uwa, bú osisi arọputara arọputa kachasi kwa nma na Lebanon, ndi nile nke nāṅu miri.
17. Ha onwe-ha so-kwa-ra ya ridarue ala-mọ, jekuru ndi ejiri mma-agha b͕u; e, ndi bu ogwe-aka-ya, ndi biri na ǹdò-ya n'etiti mba nile.
18. Ònye ka i yiri otú a nime nsọpuru na n'idi-uku n'etiti osisi nile nke Iden? ma emewo ka i rida, gi na osisi nile nke Iden, rue ala di n'okpuru uwa: n'etiti ndi anēbighi úgwù ka i gēdina, gi na ndi ejiri mma-agha b͕u. Nka bu Fero-na ìgwè ndi-ya nile; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.