Ezikiel 30:21-26 Bible Nso (IGBOB)

21. Nwa nke madu, ogwe-aka nke Fero, bú eze Ijipt, ka m'b͕ajiworo; ma, le, ekegideghi ya itiye ọgwù-ọgwugwọ di iche iche, ido ákwà-ọkiké ikegide ya, ka o we sie ike ijide mma-agha.

22. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide Fero, bú eze Ijipt, M'gāb͕aji kwa ogwe-aka-ya abua, ma nke siri ike, ma nke b͕ajiri ab͕aji; M'gēme kwa ka mma-agha-ya si n'aka-ya da.

23. M'gāchusa kwa ndi Ijipt n'etiti mba nile, fesa kwa ha n'ala nile.

24. M'gēme kwa ka ogwe-aka abua nke eze Babilon sie ike, M'gētiye kwa mma-agham n'aka-ya: ma M'gāb͕aji ogwe-aka abua nke Fero, ọ gāsu kwa ude nke onye emeruru aru nke-uku n'iru ya.

25. M'gēme kwa ka ogwe-aka abua nke eze Babilon sie ike, ma ogwe-aka abua nke Fero gāda; ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gētiye mma-agham n'aka eze Babilon, ọ we setipu ya n'ebe ala Ijipt di.

26. M'gāchusa kwa ndi Ijipt n'etiti mba nile, fesa kwa ha n'ala nile; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Ezikiel 30