Ezikiel 30:14-26 Bible Nso (IGBOB)

14. M'gēme kwa ka Patros tọb͕ọrọ n'efu, M'gētiye kwa ọku nime Zoan, me kwa ihe nile ekpere ikpe nime No.

15. M'gāwukwasi kwa ọnumam nime Sin, bú ebe siri ike nke Ijipt; M'gēbipu igwè ndi No.

16. M'gētiye kwa ọku n'Ijipt; Sin gāb͕ali nke-uku, No ka agētipu: Nof gēnwe kwa ndi-nkpab͕u ogologo ubọchi nile.

17. Umu-okorọbia nke Even na Pi-beset gāda site na mma-agha: obodo ndia gāla na ndọta-n'agha.

18. Ọ bu kwa na Tehafnehes ka ubọchi gāb͕a ọchichiri, mb͕e M'gāb͕aji yoke nile nke Ijipt n'ebe ahu, npako nke ike-ya gākwusi kwa nime ya: ya onwe-ya, igwe-oji gēkpuchi ya, umu-ya ndinyom gāla kwa na ndọta-n'agha.

19. M'gēme kwa ihe nile ekpere n'ikpe n'Ijipt: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

20. O rue, n'arọ nke iri-na-otù, n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-asa nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,

21. Nwa nke madu, ogwe-aka nke Fero, bú eze Ijipt, ka m'b͕ajiworo; ma, le, ekegideghi ya itiye ọgwù-ọgwugwọ di iche iche, ido ákwà-ọkiké ikegide ya, ka o we sie ike ijide mma-agha.

22. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide Fero, bú eze Ijipt, M'gāb͕aji kwa ogwe-aka-ya abua, ma nke siri ike, ma nke b͕ajiri ab͕aji; M'gēme kwa ka mma-agha-ya si n'aka-ya da.

23. M'gāchusa kwa ndi Ijipt n'etiti mba nile, fesa kwa ha n'ala nile.

24. M'gēme kwa ka ogwe-aka abua nke eze Babilon sie ike, M'gētiye kwa mma-agham n'aka-ya: ma M'gāb͕aji ogwe-aka abua nke Fero, ọ gāsu kwa ude nke onye emeruru aru nke-uku n'iru ya.

25. M'gēme kwa ka ogwe-aka abua nke eze Babilon sie ike, ma ogwe-aka abua nke Fero gāda; ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gētiye mma-agham n'aka eze Babilon, ọ we setipu ya n'ebe ala Ijipt di.

26. M'gāchusa kwa ndi Ijipt n'etiti mba nile, fesa kwa ha n'ala nile; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Ezikiel 30