Ezikiel 30:11-23 Bible Nso (IGBOB)

11. Ya onwe-ya na ndi-ya so ya, bú ndi kachasi mba nile n'ime ka madu ma jijiji, agaje ime ka ha bata ibibi ala ahu; ha gāmiputa kwa mma-agha-ha imegide Ijipt, ha gēmeju kwa ala ahu na ndi eb͕uru eb͕u.

12. M'gēme kwa ka osimiri Nail nile ghọ ebe kpọrọ nku, M'gēre kwa ala ahu n'aka ndi ọjọ, me ka ala ahu na ùjú-ya tọb͕ọrọ n'efu, site n'aka ndi ala ọzọ: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu.

13. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gēme kwa ka arusi nile la n'iyì, M'gēme kwa ihe-efu nile kwusi na Nof; ọ dighi kwa onye-isi gēsi n'ala Ijipt puta ọzọ: M'gētiye kwa egwu n'ala Ijipt.

14. M'gēme kwa ka Patros tọb͕ọrọ n'efu, M'gētiye kwa ọku nime Zoan, me kwa ihe nile ekpere ikpe nime No.

15. M'gāwukwasi kwa ọnumam nime Sin, bú ebe siri ike nke Ijipt; M'gēbipu igwè ndi No.

16. M'gētiye kwa ọku n'Ijipt; Sin gāb͕ali nke-uku, No ka agētipu: Nof gēnwe kwa ndi-nkpab͕u ogologo ubọchi nile.

17. Umu-okorọbia nke Even na Pi-beset gāda site na mma-agha: obodo ndia gāla na ndọta-n'agha.

18. Ọ bu kwa na Tehafnehes ka ubọchi gāb͕a ọchichiri, mb͕e M'gāb͕aji yoke nile nke Ijipt n'ebe ahu, npako nke ike-ya gākwusi kwa nime ya: ya onwe-ya, igwe-oji gēkpuchi ya, umu-ya ndinyom gāla kwa na ndọta-n'agha.

19. M'gēme kwa ihe nile ekpere n'ikpe n'Ijipt: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

20. O rue, n'arọ nke iri-na-otù, n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-asa nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,

21. Nwa nke madu, ogwe-aka nke Fero, bú eze Ijipt, ka m'b͕ajiworo; ma, le, ekegideghi ya itiye ọgwù-ọgwugwọ di iche iche, ido ákwà-ọkiké ikegide ya, ka o we sie ike ijide mma-agha.

22. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide Fero, bú eze Ijipt, M'gāb͕aji kwa ogwe-aka-ya abua, ma nke siri ike, ma nke b͕ajiri ab͕aji; M'gēme kwa ka mma-agha-ya si n'aka-ya da.

23. M'gāchusa kwa ndi Ijipt n'etiti mba nile, fesa kwa ha n'ala nile.

Ezikiel 30