Ezikiel 27:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova we ruem nti, si,

2. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, buliere Taia abù-ákwá;

3. si Taia, Gi onye bi na ab͕ata oké osimiri, onye bu onye-ahia nke ndi nile di iche iche rue ọtutu agwe-etiti, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Taia, gi onwe-gi asiwo, Mu onwem bu ebe mazuru nma.

4. N'etiti oké osimiri ka ókè-ala-gi nile di, ndi wuworo gi emewo ka ima-nma-gi zue okè.

5. Osisi fir nke si na Senia aputa ka ha jiworo mere gi ibo-ub͕ọ nile: osisi cedar nke si na Lebanon aputa ka ha wereworo imere gi akpu-ub͕o.

Ezikiel 27