Ezikiel 23:4-23 Bible Nso (IGBOB)

4. Ma aha-ha bu Ohola, ya bu nke-okenye, na Oholiba, bú nwa-nne-ya: ha we ghọ ndi nkem, mua umu-ndikom na umu-ndinyom. Ma aha-ha, Sameria bu Ohola, Jerusalem bu Oholiba.

5. Ohola we kwa iko mb͕e ọ nọ n'okpurum; agu ndi nāhu ya n'anya we gua ya, bú ndi Asiria ndi bu ab͕ata-obi-ya,

6. ndi yiri uwe anunu, ha bu ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze, umu-okorọbia anāchọsi ike ka ha nile bu, ha bu ndi-inyinya nānọkwasi inyinya.

7. O we kwaso ha iko nke-uku, ndi arọputara arọputa nke umu Asiria ka ha nile bu: ma onye ọ bula nke agu ya guru ya, arusi nile ha ka o ji merua onwe-ya.

8. Ma ikwa-iko-ya nile nke sitere n'Ijipt ka ọ nārapughi; n'ihi na ya na ha dinara mb͕e ọ di na nwata, ndi ahu pi-kwa-ra ọnu-ọnu ara-ya abua aka, bú nke o nwere mb͕e ọ di nāmaghi nwoke: ha we wukwasi ya ikwa-iko-ha dika miri.

9. N'ihi nka ka M'nyere ya n'aka ndi nāhu ya n'anya, n'aka umu Asiria, ndi agu ha guru ya.

10. Ndi ahu kpughere ọtọ-ya: umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom ka ha chiri, ma ya onwe-ya ka ha jiri mma-agha b͕ue: o we ghọrọ ndinyom aha iji dọ ha aka na nti; ọ bu kwa ihe nile ekpere n'ikpe ka ha mere n'aru ya.

11. Nwa-nne-ya nwanyi, bú Oholiba, we hu nka, ma o bibiri onwe-ya kari nwa-nne-ya n'agu ndikom nke guru ya, na n'ikwa-iko-ya nile nke kariri ikwa-iko nile nke nwa-nne-ya.

12. Agu umu Asiria guru ya, bú ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze, ndi bu ab͕ata-obi-ya, ndi yiri uwe mab͕uru onwe-ya, ha bu ndi-inyinya nānọkwasi inyinya, umu-okọrọbia anāchọsi ike ka ha nile bu.

13. M'we hu na ọ ruru árú; otù uzọ ka ha abua siri.

14. O we tukwasi ihe n'ikwa-iko-ya; o we hu ndikom akàrari na mb͕idi, bú onyinyo ndi Kaldea eji ihe-otite nācha uhie uhie kà,

15. ndi ekereri ihe-ọkiké n'úkwù-ha, ndi ejiri ákwà esijiri esiji kebiga isi-ha ókè, n'ile ha anya ndi-isi-agha ka ha nile bu, dika oyiyi umu Babilon nke Kaldea, bú ala amuru ha.

16. Agu ha we gua ya mb͕e ọ nēle ha anya, o we zigara ha ndi-ozi rue Kaldea.

17. Umu Babilon we biakute ya n'ihe-ndina nke ikwa-iko, ha we merua ya n'ikwa-iko nile ha, o we rua árú site na ha, nkpuru-obi-ya we kewapu n'ebe ha nọ.

18. O we kpughe ikwa-iko-ya nile, kpughe kwa ọtọ-ya: nkpuru-obim we kewapu n'aru ya, dika nkpuru-obim si ekewapu n'aru nwa-nne-ya.

19. O we me ka ikwa-iko-ya nile ba uba, n'icheta ubọchi nile ọ di na nwata, mb͕e ọ kwara iko n'ala Ijipt.

20. Agu ndikom-ha nākwa iko we gua ya, ndi anu-aru-ha bu anu-aru inyinya-ibu, uré-ha bu kwa uré inyinya.

21. I we leta ajọ ihe-nzube nke mb͕e i di na nwata, n'ipi ọnu-ọnu ara-gi abua nke ndi Ijipt piri n'ihi ara abua nke i nwere mb͕e i di na nwata.

22. N'ihi nka, Oholiba, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje ikpọte ndi nāhu gi n'anya imegide gi, bú ndi nkpuru-obi-gi kewapuworo n'ebe ha nọ, M'gēme kwa ka ha si n'ebe nile di buruburu biakwasi gi;

23. bú umu Babilon na Kaldea nile, na Pekod na Shoa na Koa, ha na umu Asiria nile: bú umu-okorọbia anāchọsi ike, ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze ka ha nile bu, ha bu ndi-isi-agha na ndi akpọrọ akpọ, ndi nānọkwasi n'inyinya ka ha nile bu.

Ezikiel 23