36. Jehova we sim: Nwa nke madu, i gēkpe Ohola na Oholiba ikpe? gosi kwa ha ihe-árú nile ha.
37. N'ihi na ha akwawo iko, ọbara di kwa n'aka-ha, ọ bu kwa arusi nile ha ka ha kwasoworo iko; ọzọ kwa, umu-ha ndikom, bú ndi ha mutaram, ka ha mere ka ha gabigara ha ọku, ka o we ripia ha.
38. Ọzọ kwa, nka ka ha meworom: ha emeruwo ebe nsọm n'ubọchi ahu, me ka ubọchi-izu-ikem nile ghara idi nsọ.
39. N'ihi na mb͕e ha b͕uru umu-ha ndikom nye arusi nile ha, ha we bata n'ebe nsọm ubọchi ahu ime ka ọ ghara idi nsọ; ma, le, otú a ka ha meworo n'etiti ulom.
40. Ọzọ kwa, unu nēziga ikpọ ndikom ndi nēsi n'ebe di anya bia: bú ndi ezigaworo onye-ozi, ma, le, ha biara; ndi i sara aru n'ihi ha, de ihe n'anya-gi abua, chiri ihe-ichọ-nma chọ onwe-gi nma,
41. nọkwasi n'ihe-ndina di nsọpuru, nke table edoro n'usoro di kwa n'iru ya, ọ bu kwa ihe-nsure-ọkum nke nēsì ísì utọ na manum ka i dọbara n'elu ya.