21. I we leta ajọ ihe-nzube nke mb͕e i di na nwata, n'ipi ọnu-ọnu ara-gi abua nke ndi Ijipt piri n'ihi ara abua nke i nwere mb͕e i di na nwata.
22. N'ihi nka, Oholiba, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje ikpọte ndi nāhu gi n'anya imegide gi, bú ndi nkpuru-obi-gi kewapuworo n'ebe ha nọ, M'gēme kwa ka ha si n'ebe nile di buruburu biakwasi gi;
23. bú umu Babilon na Kaldea nile, na Pekod na Shoa na Koa, ha na umu Asiria nile: bú umu-okorọbia anāchọsi ike, ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze ka ha nile bu, ha bu ndi-isi-agha na ndi akpọrọ akpọ, ndi nānọkwasi n'inyinya ka ha nile bu.
24. Ha gābiakwasi kwa gi chiri ihe-agha, na ub͕ọ-ala, na wheel nākpọre akpọre, chiri kwa nkpọkọta nke ndi di iche iche; ọta uku na ọta na okpu-agha ka ha gēji do onwe-ha imegide gi buruburu: M'gēnye kwa ha ikpé n'aka, ha gēkpe kwa gi n'ikpe nile ha.
25. M'gēdo kwa ekworom imegide gi, ha gēmeso kwa gi n'ọnuma; imi-gi na nti-gi abua ka ha gēwezuga; ọzọ, ndi gēsota gi n'azu gāda site na mma-agha: umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom ka ha gāchiri; ọku gēripia kwa ndi gēsota gi n'azu.
26. Ha gēyipu kwa uwe-gi nile n'aru-gi, chiri ihe-gi nile mara nma.