Ezikiel 22:10-14 Bible Nso (IGBOB)

10. Ọtọ nna ka ekpugheworo nime gi: nwanyi nke ruru árú n'idi-na-nsọ-ya ka ha wedaworo n'ala nime gi.

11. Ọzọ, otù nwoke esorowo nwunye nke madu-ibe-ya me ihe-árú; nwoke ọzọ emeruwo nwunye nwa-ya n'ajọ ihe-nzube; nwoke ọzọ ewedawo nwa-nne-ya nwayi, bú nwa nke nna-ya, n'ala nime gi.

12. Ngo ka ha riworo nime gi iwusi ọbara; uma na ọmuru-nwa ka i naraworo, i we were nmeb͕u rita urù nēzighi ezi n'aka madu-ibe-gi nile, ma Mu onwem ka i chezọworọ, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

13. Ma, le, akuwom ọbu-akam n'ebe urù-gi nēzighi ezi nke i ritaworo di, na n'ihi ọbara-gi nke diworo n'etiti gi.

14. Obi-gi, ò gēguzo? ma-ọbu aka-gi abua, hà gādi ike n'ubọchi ndia mb͕e Mu onwem nēmeso gi? Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo, me kwa ya.

Ezikiel 22