1. Okwu Jehova we ruem nti, si,
2. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, ì gēkpe ikpe, ì gēkpe obodo ọbara nka ikpe? i gēme kwa ka ọ mara ihe-árú nile ya.
3. I gāsi kwa, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le obodo nke nāwusi ọbara n'etiti ya, ka mb͕e-ya we bia, nke nēme kwa arusi di iche iche megide onwe-ya imeru onwe-ya!
4. N'ọbara-gi, bú nke i wusiworo, ka ikpe maworo gi, ọ bu kwa n'arusi-gi nile, bú nke i meworo, ka i ruru árú; i we me ubọchi-gi ka ha biarue nso, i we biarue ọgwugwu arọ-gi nile: n'ihi nka ka M'meworo gi ka i ghọrọ mba nile ihe-ita-uta, ka i ghọ-kwa-ra ala nile ihe-ọchì.
5. Ndi di nso na ndi di anya n'ebe i nọ gāchì gi ọchì, gi obodo nke aha-gi ruru árú, nke juputara n'ọb͕ub͕a-aghara.
6. Le, ndi-isi Israel, onye ọ bula ka ogwe-aka-ya ra, anọwo nime gi iwusi ọbara.
7. Nna na nne ka ha lelìworo nime gi; ọbìa ka ha jiworo nmeb͕u emeso n'etiti gi: nwa-nb͕ei na nwanyi di-ya nwuru ka ha meworo ihe-ike nime gi.