Ezikiel 20:6-12 Bible Nso (IGBOB)

6. n'ubọchi ahu ka M'weliri akam nye ha, ime ka ha si n'ala Ijipt puta ba n'ala nke M'ledoro nye ha, nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, nke bu ima-nma nke ala nile:

7. M'we si ha, Tufuenu, onye ọ bula ihe-árú nile nke anya-ya abua, unu eji-kwa-la arusi nile nke Ijipt merua onwe-unu; Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

8. Ha we nupu isi n'okpurum, ha ekweghi kwa igem nti; ha etufughi, onye ọ bula ihe-árú nile nke anya-ya abua, ha arapughi kwa arusi nile nke Ijipt: M'we si na M'gāwukwasi ha ọnumam, imezu iwem megide ha n'etiti ala Ijipt.

9. Ma alurum ọlu n'ihi aham, ka ewe ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ n'anya mba nile, ndi ha onwe-ha nọ n'etiti ha, ndi M'mere ka ha maram n'anya-ha, n'ime ka ha si n'ala Ijipt puta.

10. M'we me ka ha si n'ala Ijipt puta, M'we me ka ha ba n'ọzara.

11. M'we nye ha ukpurum nile, me ka ha mara ikpém nile, nke madu gādi kwa ndu nime ha, ma o me ha.

12. Ọzọ, ubọchi-izu-ikem nile ka M'nye-kwa-ra ha, ighọ ihe-iriba-ama n'etiti Mu na ha, ka ha we mara na Mu onwem bu Jehova, Nke nēdo ha nsọ.

Ezikiel 20