20. M'gāb͕asa ub͕um n'aru ya, agāma kwa ya n'ọnyàm, M'gēme kwa ka ọ biarue Babilon, Mu na ya gēkpe kwa ikpe n'ebe ahu bayere nmekpu-ya nke o mekpuru megidem.
21. Ma ndi-ya nile ndi b͕alagara ab͕alaga n'usu-ndi-agha-ya nile gāda site na mma-agha, ndi fọduru gāb͕asa-kwa-ra ifufe nile ọ bula: unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.
22. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mu onwem gēwere kwa ufọdu n'ọnu-ọnu osisi cedar di elu, kua ya; n'ọnu alaka-ya nke wara ọhu ka M'gākubipu alaka di nrò, Mu onwem gāku kwa ya n'elu ugwu di elu nke atuliri elu: