Ezikiel 16:52-55 Bible Nso (IGBOB)

52. Gi onwe-gi kwa, būru ihere-gi, ebe i kpeworo uche-gi bayere umu-nne-gi ndinyom; site na nmehie-gi nile nke i meworo ihe-árú na ha kari ha, ha bu ndi ezi omume kari gi: e, gi onwe-gi kwa, ka ihere me gi, būru kwa ọnọdu-ihere-gi, n'ihi na i guworo umu-nne-gi ndinyom na ndi ezi omume.

53. M'gēme kwa ka ndọta-n'agha-ha chigharia, bú ndọta-n'agha nke Sọdọm na umu-ya ndinyom, na ndọta-n'agha nke Sameria na umu-ya ndinyom, na ndọta-n'agha nke ndi-gi adọtara n'agha n'etiti ha:

54. Ka i we būru ọnọdu-ihere-gi, ka ihere we me kwa gi n'ihi ihe nile nke i meworo, n'ikasi ha obi.

55. Umu-nne-gi ndinyom, bú Sọdọm na umu-ya ndinyom, gēchighata n'ọnọdu mb͕e ochie ha, Sameria na umu-ya ndinyom gēchighata kwa n'ọnọdu mb͕e ochie ha, gi onwe-gi na umu-gi ndinyom gēchighata kwa n'ọnọdu mb͕e ochie unu.

Ezikiel 16