Ezikiel 13:2-8 Bible Nso (IGBOB)

2. Nwa nke madu, bue amuma megide ndi-amuma Israel ndi nēbu amuma, gi si ndi nēbu amuma si n'obi-ha puta, Nurunu okwu Jehova;

3. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ahuhu diri ndi-amuma nzuzu, ndi nējeso mọ nke ha, na ihe nke ha nāhughi!

4. Dika nkita-ọhia nime nkpọnkpọ ebe ka ndi-amuma-gi diworo, gi Israel.

5. Unu arigoghi na ntipú, unu ab͕aghi kwa ogige nye ulo Israel, iguzo n'agha n'ubọchi Jehova.

6. Ha ahuwo ọhù efu na iju-ase ugha, bú ndi nāsi, Ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; ma Jehova eziteghi ha: ha we le anya na ha gēme ka okwu guzosie ike.

7. Ọ̀ bughi ọhù efu ka unu huworo, ọ̀ bughi kwa okwu iju-ase ugha ka unu kwuworo, mb͕e unu nāsi, Ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; ma Mu onwem ekwughi okwu?

8. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na unu ekwuwo okwu efu, hu ọhù ugha, n'ihi nka, le, Mu nēmegide unu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Ezikiel 13