Ezikiel 12:6-9 Bible Nso (IGBOB)

6. N'anya-ha ka i gēbu ya n'ubu-gi, n'ọchichiri ka i gēbupu ya; iru-gi ka i gēkpuchi, ka i we ghara ihu ala: n'ihi na ewereworo gi nye ulo Israel ka i buru ihe-ebube.

7. M'we me otú a, dika enyerem iwu: ihem nile ka m'buputara n'ehihie, dika ihe nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ, n'anyasi m'we ji akam gwupuere onwem mb͕idi; n'ọchichiri ka m'bupuru ya, n'ubum ka m'buru ya n'anya-ha.

8. Okwu Jehova we ruem nti n'ututu, si,

9. Nwa nke madu, hà asighi gi, bú ulo Israel, ulo nke nnupu-isi ahu, Gini ka gi onwe-gi nēme?

Ezikiel 12