3. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, mere onwe-gi ihe di iche iche nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ, je biri n'ala ọzọ n'ehihie n'anya-ha; i gēsi kwa n'ọnọdu-gi je biri n'ebe ọzọ n'anya-ha: eleghi anya ha gāhu, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.
4. I gēbuputa kwa ihe-gi nile n'ehihie n'anya-ha, dika ihe nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ: gi onwe-gi gāpu kwa n'anyasi n'anya-ha, dika ọpupu nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ.
5. Gwupuere onwe-gi mb͕idi n'anya-ha, si n'ebe ahu bupu ihe.
6. N'anya-ha ka i gēbu ya n'ubu-gi, n'ọchichiri ka i gēbupu ya; iru-gi ka i gēkpuchi, ka i we ghara ihu ala: n'ihi na ewereworo gi nye ulo Israel ka i buru ihe-ebube.