Ezikiel 11:7-17 Bible Nso (IGBOB)

7. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ndi-unu eb͕uru eb͕u ndi unu tọb͕ọworo n'etiti ya, ha onwe-ha bu anu, obodo nka bu kwa ite: ma unu ka M'gēme ka unu si nime ya puta.

8. Mma-agha ka unu tuworo egwu ya; ọ bu kwa mma-agha ka M'gēme ka ọ biakwasi unu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

9. M'gēme kwa ka unu si n'etiti ya puta, M'gēnye kwa unu n'aka ndi ala ọzọ, me ihe nile ekpere n'ikpe n'etiti unu.

10. Site na mma-agha ka unu gāda; n'ókè-ala Israel ka M'gēkpe unu ikpe; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

11. Obodo nka agaghi-aghọrọ unu ite, unu onwe-unu agaghi-aghọ kwa anu n'etiti ya; n'ókè-ala Israel ka M'gekpe unu ikpe;

12. unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova: n'ihi na n'ukpurum nile ka unu nējegharighi, ọ bu kwa ihe nile nke M'kpere n'ikpe ka unu nēmeghi, kama ọ bu dika ikpé nile nke mba nile nke di unu buruburu si di ka unu meworo.

13. O rue, mb͕e M'buru amuma, na Pelataia nwa Benaia nwuru. M'we da kpue irum n'ala, tie nkpu n'oké olu, si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! ọ̀ bu ka ndi Israel fọduru gwusia ka Gi onwe-gi nēme?

14. Okwu Jehova we ruem nti, si,

15. Nwa nke madu, umu-nne-gi, ọbuná umu-nne-gi, bú ndi-nb͕aputa-gi, na ulo Israel nile, ha nile, ọ bu ha ka ndi bi na Jerusalem siri, Sinu n'ebe Jehova nọ je n'ebe di anya; ọ bu ayi ka enyeworo ala nka ka ọ buru ihe-nnweta:

16. n'ihi nka si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ebe M'meworo ka ha je n'ebe di anya n'etiti mba nile, ebe M'chusawo-kwa-ra ha n'ala nile, M'gāghọ-kwa-ra ha ebe nsọ nwa mb͕e ntà n'ala nile ebe ha bàworo.

17. N'ihi nka si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gāchikọputa unu nime ndi nile di iche iche, me kwa ka unu si n'ala nile ebe achusaworo unu zukọta, M'gēnye kwa unu ala Israel.

Ezikiel 11