10. Ma dika ha si di n'ile ha anya, otù oyiyi ka ha anọ nwere, dika agāsi na wheel di n'etiti wheel.
11. Mb͕e ha nāga, n'akuku anọ ha ka ha nāga: ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga, kama n'ebe ahu nke isi-ha nēche iru, n'azu ya ka ha nāga; ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga.
12. Anu-aru nile ha na azu-ha na aka-ha na nkù-ha na wheel-ha juputara n'anya anya buruburu, ọ bu ha anọ ka wheel nile ha diri.
13. Ma wheel anọ ahu, ha ka anākpọ na ntim abua, Ihe nākpọre.