Ezikiel 1:19-28 Bible Nso (IGBOB)

19. Ma mb͕e ihe anọ ahu di ndu nāga, wheel-ha nāga n'akuku ha: ọzọ, mb͕e anēsi n'elu uwa buli ihe anọ ahu di ndu, anēbuli wheel-ha.

20. Ebe ọ bula Mọ Chineke nwere ije ka ha nāga; n'ebe ahu ka Mọ Chineke nwere ije: anēbuli kwa wheel-ha n'akuku ha: n'ihi na Mọ nke ihe ahu di ndu di nime wheel-ha.

21. Mb͕e ihe anọ ahu nāga, wheel nāga; ọ bu kwa mb͕e ihe anọ ahu nēguzo ka wheel nēguzo; ọ bu kwa mb͕e anēsi n'elu uwa bulie ihe anọ ahu ka anēbuli wheel-ha n'akuku ha: n'ihi na Mọ nke ihe ahu di ndu di nime wheel-ha.

22. Ọzọ, oyiyi nke mbara-ígwé di n'elu isi ihe ahu di ndu, dika ib͕u-maramara crystal di egwu si di, nke esetiri eseti n'elu isi-ha n'elu.

23. Ọzọ, n'okpuru mbara-ígwé ahu nkù nile ha guzoziri eguzozi, otù n'ebe ibe-ya di: ha nile n'otù n'otù nwere nkù abua nke nēkpuchi aru-ha n'otù akuku, ha nile n'otù n'otù nwe-kwa-ra nkù abua nke nēkpuchi aru-ha n'akuku ọzọ.

24. Mb͕e ha nāga m'we nu olu nkù nile ha, dika olu ọtutu miri, dika olu nke Onye puru ime ihe nile, olu nkpọtu dika olu ọmuma-ulo-ikwū: mb͕e ha guzoro, ha wuda nkù-ha.

25. Olu we di n'elu mbara-ígwé ahu nke di n'elu isi-ha: mb͕e ha guzoro, ha wuda nkù-ha.

26. Ọzọ, n'elu mbara-ígwé ahu nke di n'elu isi-ha oyiyi nke oche-eze di, dika nkume sapphire si di n'ile ya anya: ọzọ, n'elu oyiyi oche-eze ahu otù oyiyi di, nke di ka madu si di n'ile ya anya, n'elu oche-eze ahu n'elu.

27. M'we hu ihe di ka ib͕u-maramara amber, ihe di ka ọku si di n'ile ya anya nke di nime ya buruburu, site n'ihe bu úkwù-ya n'ile ya anya we rigo elu; ọzọ, site n'ihe bu úkwù-ya n'ile ya anya we ridata ahurum ihe nke di ka ọku si di n'ile ya anya, onwunwu-ọku di-kwa-ra ya buruburu.

28. Dika eke-na-ogwurugwu si di n'ile ya anya, bú nke di n'igwe-oji n'ubọchi nke miri-ozuzo, otú a ka onwunwu-ọku ahu si di n'ile ya anya, bú nke di ya buruburu. Nka bu ka oyiyi nke ebube Jehova si di n'ile ya anya. M'we hu ya, da kpue irum n'ala, m'we nu olu nke otù Onye nēkwu okwu.

Ezikiel 1