16. Ka wheel nile ahu na otú emere ha si di n'ile ha anya, ha di ka ib͕u-maramara nkume beryl: ọ bu kwa otù oyiyi ka ha anọ nwere: ka ha na otú emere ha si di n'ile ha anya, ha di ka agāsi na ọ bu wheel n'etiti wheel.
17. Ọ bu n'akuku anọ ha ka ha nāga mb͕e ha nāga: ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga.
18. Ma azu wheel nile ha, ha di elu, ha di kwa egwu; azu wheel nile ha juputara n'anya anya buruburu ha anọ.
19. Ma mb͕e ihe anọ ahu di ndu nāga, wheel-ha nāga n'akuku ha: ọzọ, mb͕e anēsi n'elu uwa buli ihe anọ ahu di ndu, anēbuli wheel-ha.
20. Ebe ọ bula Mọ Chineke nwere ije ka ha nāga; n'ebe ahu ka Mọ Chineke nwere ije: anēbuli kwa wheel-ha n'akuku ha: n'ihi na Mọ nke ihe ahu di ndu di nime wheel-ha.
21. Mb͕e ihe anọ ahu nāga, wheel nāga; ọ bu kwa mb͕e ihe anọ ahu nēguzo ka wheel nēguzo; ọ bu kwa mb͕e anēsi n'elu uwa bulie ihe anọ ahu ka anēbuli wheel-ha n'akuku ha: n'ihi na Mọ nke ihe ahu di ndu di nime wheel-ha.