11. bú akwukwọ nke eze kwere nime ha ka ndi-Ju ndi nọ n'obodo nile ọ bula kpọkọta onwe-ha, guzo kwa n'ihi ndu-ha, ikpochapu, na ib͕u, na ime ka ha la n'iyì, bú usu-ndi-agha nile nke ndi ahu na ala ahu anāchi achi ndi nākpab͕u ha, ma umu-ntakiri-ha, ma ndinyom-ha, na iluta ihe-nkwata-ha n'agha,
12. n'ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, n'otù ubọchi, bú n'ubọchi nke-iri-na-atọ nke ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada.
13. Ndeputa odide-akwukwọ, nke agēnye dika iwu n'ala nile ọ bula anāchi achi, ekpughere ya nye ndi nile di iche iche, ka ndi-Ju nọ na njikere bayere ubọchi a, ibọrọ onwe-ha ọ́bọ̀ n'iru ndi-iro-ha.
14. Ndi-ọb͕a-ọsọ ndi inyinya ukwu ọsọ na inyinya mule nēbu puru, ebe ewere okwu eze kwalie ha, me ka ha me ngwa; enye-kwa-ra iwu ahu nime Shushan, bú ulo uku eze.