Esta 2:4-6 Bible Nso (IGBOB)

4. ka nwa-ab͕ọghọ nke di nma n'anya eze buru nwunye eze n'ọnọdu Vashti. Ihe ahu we di nma n'anya eze; o we me otú a.

5. Otù nwoke, bú onye-Ju, nọ na Shushan, bú ulo uku eze, aha-ya bu Mọdekai, nwa Jaia, nwa Shimai, nwa Kish, bú onye Benjamin;

6. onye emere ka o si na Jerusalem je biri n'ala ọzọ n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi emere ha na Jekonaia, bú eze Juda, ka ha je biri n'ala ọzọ, onye Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ọ je biri n'ala ọzọ.

Esta 2