Esta 2:3-5 Bible Nso (IGBOB)

3. ka eze me kwa ndi-nlekọta n'ala nile anāchi achi nke ala-eze-ya, ka ha we chikọta umu-ab͕ọghọ nile ndi nāmaghi nwoke, bú ndi di nma ile anya, rue Shushan, bú ulo uku eze, rue ulo ndinyom, rue aka Hege, bú onozi eze, onye nēdebe ndinyom; ka enye kwa ha ihe-nsacha nile ha:

4. ka nwa-ab͕ọghọ nke di nma n'anya eze buru nwunye eze n'ọnọdu Vashti. Ihe ahu we di nma n'anya eze; o we me otú a.

5. Otù nwoke, bú onye-Ju, nọ na Shushan, bú ulo uku eze, aha-ya bu Mọdekai, nwa Jaia, nwa Shimai, nwa Kish, bú onye Benjamin;

Esta 2