Emos 8:4-9 Bible Nso (IGBOB)

4. Nurunu nka, unu ndi nēkusi ume ike ilo ob͕eye, ndi nāchọ kwa ime ka ndi ala-unu ewedara n'ala kwusi,

5. si, Òle mb͕e ọnwa ọhu gāgabiga, ka ayi we re ọka? na ubọchi-izu-ike, ka ayi we cho ọka wheat? n'ime ka ọtùtù ephah di ntà, na ime ka ego shekel di uku, na ime ka ihe-ọtùtù aghughọ b͕agọrọ;

6. ib͕a ndi nēnweghi ike n'ọla-ọcha, na ib͕a ob͕eye n'ihi akpukpọ-ukwu abua, ọ bu kwa ọka wheat afuchapuru ka ayi gēre.

7. Jehova ejiwo npako Jekob ṅua iyi, si, Agaghm-echezọ ọlu nile ha ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi.

8. Ala, ọ̀ gaghi-ama jijiji n'ihi nka? onye ọ bula nke bi nime ya, ọ̀ gaghi-eru kwa újú? e, ọ gērujucha dika osimiri Nail; ọ gāmaghari amaghari kwa, tacha, dika osimiri Nail nke Ijipt.

9. Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), na M'gēme ka anyanwu da n'etiti-ehihie, M'gēme kwa ka uwa b͕a ọchichiri mb͕e chi bọchara abọcha.

Emos 8