Emos 5:23-27 Bible Nso (IGBOB)

23. Wezuga n'arum ùzù abù-gi nile; ọ bu kwa ọkpukpọ une-gi nile ka M'nāgaghi-anu.

24. Ma ka ikpé ziri ezi nērùdasi ike dika miri, ezi omume kwa dika miri-iyi nke nērù mb͕e dum.

25. Ọ̀ di àjà di iche iche na onyinye-inata-iru-ọma unu wetaram n'ọzara ọgu arọ abua, unu ulo Israel?

26. É-è, kama unu eburuwo ulo-ikwū nke eze-unu na Kaiun, bú onyinyo-unu, bú kpakpando nke chi-unu, nke unu mere onwe-unu.

27. M'gēme kwa ka unu je biri n'ala ọzọ n'ofè Damaskọs, ka Jehova, Onye aha-Ya bu Chineke nke usu nile nke ndi-agha, siri.

Emos 5