10. ma M'gēzite ọku n'elu mb͕idi Taia, o gēripia kwa ulo-elu-ya nile.
11. Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Edom, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na o jiri mma-agha chu nwa-nne-ya, o bibi-kwa-ra obi-ebere-ya nile, iwe-ya we nādọka rue mb͕e ebighi-ebi, ma nrubiga-ókè nke iwe-Ya, o debewo ya mb͕e ebighi-ebi:
12. ma M'gēzite ọku na Timan, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Bọzra.
13. Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke umu Amon, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi; n'ihi na ha ab͕awawo ndinyom Gilead di ime afọ ka ha we me ka ókè-ala-ha sa mbara:
14. ma M'gēsuye ọku na mb͕idi Raba, ọ gēripia kwa ulo-elu-ya nile, n'iti-nkpu agha n'ubọchi agha, n'oké ifufe n'ubọchi oké ikuku:
15. eze-ha gāla kwa n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ya onwe-ya na ndi-isi-ya n'otù; otú a ka Jehova siri.