1. N'ihi na ihe nile a ka m'tiyere n'obim, ọbuná iledo ihe nile a; na ndi ezi omume, na ndi mara ihe, na òfùfè-ha nile, di n'aka Chineke: ma ọ bu ihu-n'anya ma-ọbu ikpọ-asì, madu adighi-ama ya; ihe nile di n'iru ha.
2. Ihe nile nādakwasi madu nile n'otù uzọ ahu: otù ndabà nādabàra onye ezi omume, dabà-kwa-ra onye nēmebi iwu; ọ nādabàra ezi madu, dabà-kwa-ra onye di ọcha, dabà-kwa-ra onye nādighi ọcha; ọ nādabàra onye nāchu àjà, dabà-kwa-ra onye nādighi-achu àjà: dika ezi madu si di, otú a ka onye-nmehie di kwa; onye nāṅu iyi di ka onye nātu egwu ọṅuṅu-iyi.