8. mb͕e ihu n'anya, na mb͕e ikpọ asì; mb͕e agha, na mb͕e udo.
9. Òle ihe fọduru onye nālu ọlu n'ihe nke ya onwe-ya nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nime ya?
10. Ahuwom nweda-n'ala nke Chineke nyeworo umu madu iweda ha n'ala nime ya.
11. Ihe nile ọ bula ka O meworo ka ọ ma nma na mb͕e-ya: ọzọ, mb͕e ebighi-ebi ka O tiyeworo n'obi-ha, ma ka O si tiye ya madu agaghi-achọputa ọlu ahu nke Chineke luworo site na nmalite we rue na nsọtu.
12. Amawom na ọ dighi ezi ihe diri ha, ma-ọbughi ka madu ṅuria ọṅu, me kwa ezi ihe n'ogologo ndu-ya.