Deuteronomi 8:2-18 Bible Nso (IGBOB)

2. I gēcheta kwa uzọ nile nke Jehova, bú Chineke-gi, mere gi ka i je ọgu arọ abua ndia n'ọzara, ka O we weda gi n'ala, inwa gi, ka O we mara ihe nke di n'obi-gi, ma i gēdebe ihe nile O nyere n'iwu, ma-ọbu na i gaghi-edebe.

3. O we weda gi n'ala, me ka agu gua gi, O we me ka i rie manna ahu, nke i nāmaghi, nke nna-gi-hà nāmaghi kwa; ka O we me ka i mara na ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu, kama ọ bu ihe nile ọ bula nke nēsi n'ọnu Jehova puta ka madu gēji di ndu.

4. Uwe-nb͕okwasi-gi akapughi nká n'aru gi, ukwu-gi azaghi kwa aza, ọgu arọ abua ndia.

5. I gāma kwa n'obi-gi, na, dika nwoke si adọ nwa-ya nwoke aka na nti, otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, nādọ gi aka na nti.

6. I gēdebe kwa ihe Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, ka i we je ije n'uzọ-Ya nile, tu kwa egwu Ya.

7. N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nēme ka i ba n'ezi ala, bú ala iyi miri, na nke isi-iyi na ob͕u-miri, nāputa na ndagwurugwu na n'ugwu:

8. ala nke ọka wheat na ọka barley, na osisi vine, na osisi fig, na pomegranate; ala nke osisi olive nēnye manu, na nke manu-aṅu;

9. ala nke ọ bughi n'idi-ukọ ka i gēri nri nime ya, ọ dighi ihe ọ bula gākọ gi nime ya; ala nke nkume-ya bu ígwè, nke i gēgwuputa kwa ọla n'ugwu-ya.

10. I gēri kwa, afọ gēju kwa gi, i gāgọzi kwa Jehova, bú Chineke-gi, n'elu ezi ala ahu nke O nyeworo gi.

11. Lezie onwe-gi anya ka i ghara ichezọ Jehova, bú Chineke-gi, n'edebeghi ihe nile O nyere n'iwu, na ikpé-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta:

12. ka o we ghara ibu, mb͕e i nēri ihe, riju afọ, wu kwa ezi ulo, we biri nime ha:

13. mb͕e ìgwè ehi-gi na ìgwè ewu na aturu-gi nāba kwa uba, mb͕e ọla-ọcha na ọla-edo nāba-kwa-ra gi uba, mb͕e ihe nile i nwere nāba kwa uba;

14. na obi-gi gādi elu, i we chezọ Jehova, bú Chineke-gi, Onye nēme ka i si n'ala Ijipt, si kwa n'ulo ndi-orù, puta;

15. Onye nēme ka i je ije n'ọzara uku ahu nke di egwu, nke agwọ nke yiri ọku na akpi di nime ya, na ala akpiri-ikpọ-nku nke miri nādighi ya; Onye nēme ka miri si n'oké nkume ọmu ahu putara gi;

16. Onye nēme ka i rie manna n'ọzara, nke nna-gi-hà nāmaghi; ka O we weda gi n'ala, ka O we nwa kwa gi, ime gi nma n'ikpe-azu-gi:

17. i we si n'obi-gi, Ikem na ume akam emetaworom àkù a.

18. Ma i gēcheta Jehova, bú Chineke-gi, n'ihi na Ya onwe-ya bu onye nēnye gi ike imeta àkù; ka Ọ we me ka ọb͕ub͕a-ndu-Ya guzosie ike, nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi imere ha, otú ọ di ta.

Deuteronomi 8